Joshua 21:22-28 Bible Nso (IGBOB)

22. na Kibzaim na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.

23. Site kwa n'ebo Dan, Elteke na ebe-ita-nri-ya nile, na Gibeton na ebe-ita-nri-ya nile;

24. na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.

25. Site kwa na nkera ebo Manase, Tanak na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo abua.

26. Obodo nile di iri, ha na ebe-ita-nri-ha, bú nke diri ab͕uru umu Kohat fọduru.

27. Ha nye-kwa-ra umu Giashon, ndi sitere n'ab͕uru ndi Livai, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu; na Be-eshtera na ebe-ita-nri-ya nile, site na nkera ebo Manase; obodo abua.

28. Site kwa n'ebo Isaka, Kishion na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile;

Joshua 21