Joshua 19:32-38 Bible Nso (IGBOB)

32. Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di.

33. Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan:

34. ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n'Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n'akuku Jọdan n'ọwuwa-anyanwu.

35. Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret;

36. na Adama, na Rema, na Hezoa;

37. na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa;

38. na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha.

Joshua 19