1. Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n'akuku ọwuwa-anyanwu:
2. Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;
3. na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga:
4. na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n'Ashtarot na n'Edrei,
5. nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon.