21. Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n'ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n'Anab, na n'ugwu Juda nile, na n'ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha.
22. Ọ dighi ndi Anak fọduru n'ala umu Israel; nání nime Geza, na nime Gat, na n'Ashdod, ka ha fọduru.
23. Joshua we were ala ahu nile, dika okwu nile si di nke Jehova gwara Moses; Joshua we nye ya Israel ka ọ buru ihe-nketa, dika esi kè ha n'òkè n'òkè dika ebo nile ha si di. Ala ahu we rapu ibu-agha, di jū.