Joshua 10:16-29 Bible Nso (IGBOB)

16. Eze ise ndia we b͕alaga, zo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.

17. Ewe gosi Joshua, si, Achọtawo eze ise ahu, ha ezowo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.

18. Joshua we si, Kpọrenu nkume uku rue ọnu ọb͕à ahu, do kwa ndikom n'elu ya dika ndi-nlekọta idebe ha:

19. ma unu onwe-unu eguzola; nāchunu ndi-iro-unu n'azu, tib͕u kwa ndi-ikpe-azu n'etiti ha; unu ekwela ka ha ba n'obodo di iche iche ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, enyewo ha n'aka-unu.

20. O rue, mb͕e Joshua na umu Israel tib͕usiri ha oké ntib͕u nke-uku, rue mb͕e emere ka ha gwusia, mb͕e ndi fọduru, bú ndi fọduru n'etiti ha, basi-kwa-ra n'obodo ewusiri ike,

21. na ndi Israel nile latara n'ọmuma-ulo-ikwū jekuru Joshua na Makeda n'udo: ọ dighi nwoke raghariri ire-ya megide umu Israel.

22. Joshua we si, Meghenu ọnu ọb͕à ahu, me kwa ka eze ise ndia si n'ọb͕à ahu pukutem.

23. Ha we me otú a, me ka eze ise ahu si n'ọb͕à ahu pukute ya, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon.

24. O rue, mb͕e ha mere ka eze ise ahu pukute Joshua, na Joshua kpọrọ ndikom nile nke Israel, si ndi-ọchi-agha nke ndikom agha ndi soro ya je, Bianu nso, zọkwasinu ukwu-unu n'olu eze ndia. Ha we bia nso, zọkwasi ukwu-ha n'olu-ha.

25. Joshua we si ha, Unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ; dinu ike, nwe-kwa-nu ume: n'ihi na otú a ka Jehova gēme ndi-iro-unu nile ndi unu onwe-unu nēbuso agha.

26. Emesia Joshua we tib͕ue ha, me ka ha nwua, kwuba ha n'osisi ise: ha we kwugide n'elu osisi ise ahu rue anyasi.

27. O rue, na mb͕e anyanwu nāda, na Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi ise ahu weda ha, tubà ha n'ọb͕à ahu ebe ha zoro onwe-ha, we tukwasi nkume uku n'ọnu ọb͕à ahu, rue ubọchi nke ta.

28. Joshua we were Makeda n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya na eze-ya; o wezugara ha na madu nile nke di nime ya ka ebibie ha, ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o me eze Makeda dika o mere eze Jeriko.

29. Joshua we si Makeda gabiga, ya na Israel nile, rue Libna, buso Libna agha:

Joshua 10