17. Dika ihe nile si di nke ayi gere Moses nti nime ya, otú a ka ayi gēge gi nti: nání, Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, dika Ọ nọyere Moses.
18. Onye ọ bula nke gānupu isi n'okwu-ọnu-gi, nke nānughi kwa okwu-gi nile n'ihe nile nke i nēnye ya n'iwu, agēme ka ọ nwua: nání, di ike, nwe kwa ume.