Jona 3:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we rue Jona nti nke ub͕ò abua, si,

2. Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku ahu, kpọsara ya nkpọsa ahu nke Mu onwem nāgwa gi.

3. Jona we bilie, jerue Nineve, dika okwu Jehova si di. Ma Nineve bu obodo di uku ri nne, ije nke ubọchi atọ.

Jona 3