41. Unu onwe-unu nālu ọlu nna-unu. Ha siri Ya, Amughi ayi onwe-ayi site n'ikwa-iko otù Nna ka ayi nwere, bú Chineke.
42. Jisus siri ha, Ọ buru na Chineke bu Nna-unu, unu gāhum n'anya: n'ihi na Mu onwem siri n'ebe Chineke nọ puta we bia; n'ihi na abiaghm n'Onwem, kama Ya onwe-ya ziterem.
43. N'ìhi gini ka unu nāmaghi ihe M'nēkwu? Ọ bu n'ihi na unu apughi inu okwum.