Jọn 19:32-35 Bible Nso (IGBOB)

32. Ya mere ndi-agha biara, tijie ogwe-ukwu nke onye mbu, na nke onye ọzọ, nke akpọgidere Ya na ya n'obe:

33. ma mb͕e ha biaruru Jisus, hu kwa na Ọ nwuwori ub͕u a, ha etijighi ogwe-ukwu-Ya:

34. otú ọ di, otù onye n'etiti ndi-agha were ube ma Ya n'akuku, ngwa ngwa ọbara na miri we puta.

35. Onye huworo ya ab͕awo kwa àmà, àmà-ya bu kwa ezie: onye ahu nāmata kwa na o nēkwu ezi-okwu, ka unu onwe-unu we kwere kwa.

Jọn 19