13. Ihe ọ bula unu gāriọ kwa n'aham, ihe ahu ka M'gēme, ka ewe nye Nnam otuto nime Ọkpara-Ya.
14. Ọ buru na unu gāriọm ihe ọ bula n'aham, nke ahu ka M'gēme.
15. Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu.
16. Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọyere unu rue mb͕e ebighi-ebi,
17. bú Mọ nke ezi-okwu: Onye uwa nāpughi inara; n'ihi na ọ dighi-ahu ya, ọ dighi-ama kwa Ya: unu onwe-unu mara Ya; n'ihi na Ya na unu nānọgide, Ọ gānọ kwa nime unu.
18. M'gaghi-arapu unu ka umu-nb͕ei: agajem ibiakute unu.