9. Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ bughi nání ukwum, kama akam abua kwa na isim.
10. Jisus si ya, Onye asaworo aru, nkpà isa aru ọzọ adirighi ya ma-ọbughi isa ukwu-ya, kama aru-ya dum di ọcha: unu onwe-unu di kwa ọcha, ma ọ bughi unu nile.
11. N'ihi na Ọ matara onye gaje irara Ya nye; n'ihi nka ka Ọ siri, Ọ bughi unu nile di ọcha.
12. Ya mere mb͕e Ọ sasiri ukwu-ha, chiri kwa-uwe Ya, nọdu kwa ala ọzọ, Ọ si ha, Ùnu mara ihe M'meworo unu?
13. Unu onwe-unu nākpọm, Onye-ozizí, na, Onye-nwe-ayi: unu nēkwu kwa nke-ọma; n'ihi na ọ bu otú M'di.