Jọn 12:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. Ya mere ọra madu n'etiti ndi-Ju mara na Ọ nọ n'ebe ahu: ha we bia, ọ bughi n'ihi nání Jisus, kama ka ha we le kwa Lazarọs, onye Ọ mereri ka o si na ndi nwuru anwu bilie.

10. Ma ndi-isi-nchu-àjà b͕ara ìzù ka ha we b͕u kwa Lazarọs;

11. n'ihi na ọ bu n'ihi ya ka ọtutu nime ndi-Ju nāpu, nēkwere kwa na Jisus.

12. N'echi-ya oké ìgwè madu nke biara ememe ahu, mb͕e ha nuru na Jisus nābia Jerusalem,

13. ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel.

Jọn 12