11. Ihe ndia ka O kwuru: mb͕e nka gasiri Ọ si ha, Enyi-ayi Lazarọs adawo n'ura; ma anamaga, ka M'we kpọte ya n'ura.
12. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya siri Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ dawo n'ura, agāzọputa ya.
13. Ma Jisus kwururi okwu bayere ọnwu-ya: ma ndi ahu chère na Ọ nēkwu okwu bayere ida n'ura efu.
14. Ya mere Jisus gwawara ha okwu mb͕e ahu, si, Lazarọs nwuru anwu.
15. Anamaṅuri kwa ọṅu n'ihi unu na adighi m n'ebe ahu, ka unu we kwere; otú ọ di, ka ayi jekuru ya.
16. Ya mere Tomas, onye anākpọ Didimọs, siri ibe-ya ndi nēso Jisus, Ka ayi onwe-ayi je kwa, ka ayi we so Ya nwua.