18. Jehova we kwo ekworo ala-Ya, nwe ọmiko n'aru ndi-Ya.
19. Jehova we za, si ndi-Ya, Le, M'ganēzitere unu ọka-unu na manya-vine ọhu unu na manu ọhu unu, afọ ya ewe ju unu: M'gaghi-eme kwa unu ihe-ita-uta ọzọ n'etiti mba nile:
20. ma M'gēme ka usu-ndi-agha Ugwu ahu si n'aru-unu je n'ebe di anya, M'gāchubà kwa ya n'ala kpọrọ nku na ebe tọb͕ọrọ n'efu, iru-ya n'oké osimiri Iru-anyanwu, na nsọtu-Ya n'oké osimiri Ọdida-anyanwu; ísì ọjọ ya gārigo kwa, e, ísì-ya nke jọb͕uru onwe-ya gārigo, n'ihi na o mewo onwe-Ya uku n'ime ihe.
21. Atula egwu, gi ala, te egwú ọṅù, ṅuri kwa; n'ihi na Jehova emewo Onwe-ya uku n'ime ihe.
22. Unu atula egwu, unu anu ọhia; n'ihi na ebe-ita-nri nile nke ọzara nēpuputa ahihia ndu, n'ihi na osisi nāmi nkpuru-ya, osisi fig na osisi vine nāmi nkpuru ka ike-ha ra.
23. Umu Zaion, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, ṅuri kwa na Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Ọ nēnye unu miri-ozuzo mbu ka ezi omume-Ya si di, me kwa ka oké miri-ozuzo zodatara unu, bú miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n'ọnwa mbu.