Job 9:22-29 Bible Nso (IGBOB)

22. Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri,Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.

23. Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya,Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.

24. Enyewo uwa n'aka onye-nmehie:Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya;Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?

25. Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ:Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.

26. Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì:Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.

27. Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum,Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum:

28. Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile,Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

29. Agama mu onwem ikpe;N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu?

Job 9