4. Ọ buru na edinam, m'si,Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya;Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.
5. Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá;Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.
6. Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà,Ha we gwusia nenweghi olile-anya.
7. Cheta na ndum bu ifufe:Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.
8. Anya onye nāhum agaghi-ekirim:Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.
9. Dika igwe-oji si agwusi, we la,Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.