Job 38:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa?Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.

5. Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara?Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya?

6. N'èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie?Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya,

7. Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù,Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike?

8. Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri,Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;

9. Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya,Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,

Job 38