19. Ọ̀ gēdo àkù-gi n'usoro ka i ghara inọ na nkpà?Ma-ọbu ume nile nke ike-gi?
20. Ekusila ume ike ibiaru abali,Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha.
21. Lezie anya, echela ajọ ihe iru:N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala.
22. Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya:Ònye bu onye-ozizí dika Ya?
23. Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya?Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?