Job 28:12-23 Bible Nso (IGBOB)

12. Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?

13. Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya;Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu.

14. Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di:Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam.

15. Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n'ọnọdu ya,Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya.

16. Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia,Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya.

17. Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya:Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya.

18. Agaghi-ehota coral na crystal:E, nnweta amam-ihe kariri ruby.

19. Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya,Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya.

20. Ma amam-ihe, òle ebe o si bia?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?

21. N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu,Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya.

22. Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri,Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.

23. Chineke aghọtawo uzọ-ya,Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya.

Job 28