Job 20:14-21 Bible Nso (IGBOB)

14. Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo,Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya.

15. O lodawo àkù, we b͕oputa ya:Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu.

16. Nsi aju-ala ka ọ gāmiri:Ire agwọ gēb͕u ya.

17. Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.

18. Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.

19. N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.

20. N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya,Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.

21. Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.

Job 20