Job 14:10-14 Bible Nso (IGBOB)

10. Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya:Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?

11. Miri esiwo n'oké osimiri la,Osimiri we tasia, takọrọ;

12. Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa:Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta,Agaghi-akpọte kwa ha n'ura-ha.

13. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ,Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri,Ma asi na I kparam ókè, we chetam!

14. Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ?Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche,Rue mb͕e nb͕anwem gābia.

Job 14