Job 10:18-21 Bible Nso (IGBOB)

18. N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta?M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.

19. Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m'nọ, otú a ka m'gādi;Site n'afọ nnem rue ílì ka agēbum.

20. Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa,Dopu Onwe-gi n'ebe m'nọ, ka m'we b͕asa irum nwantī,

21. Tutu alam, ghara kwa ilaghachi,Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;

Job 10