13. Ma ub͕u a, n'ihi na unu aluwo ọlu ndia nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'we gwa unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu, ma unu anughi; M'we kpọ unu òkù, ma unu azagh:
14. M'gēme kwa ulo a, nke akpọkwasiri aham, nke unu onwe-unu nātukwasi obi, M'gēme kwa ọnọdu a nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, M'gēme ha dika M'gēme ha dika M'mere Shailo.
15. M'gēsi kwa n'irum tufue unu, dika M'tufuru umu-nna-unu nile, bú nkpuru nile nke Efraim.
16. Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha, ariọ-kwa-lam aririọ: n'ihi na M'gaghi-anānu olu-gi.