Jeremaia 49:30-34 Bible Nso (IGBOB)

30. B͕alaganu, wagharia nke-uku, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Hezoa, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, aduwo ọdu megide unu, ọ chèwo kwa èchìchè megide unu.

31. Bilienu, rigorue mba nke nọ n'udo, nke bi na ntukwasi-obi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); nke nēnweghi ọnu-uzọ ma-ọbu ihe-ntuchi, nání ha nēbi.

32. Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n'agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M'gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n'ofè-ya nile ka M'gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

33. Hezoa gāghọ kwa ebe-obibi nkita-ọhia, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

34. Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere Ilam na mb͕e mbu nke ọbubu-eze nke Zedekaia, bú eze Juda, si,

Jeremaia 49