11. Rapu umu-nb͕ei-gi, Mu onwem gēdebe ha ndu; ka ndinyom-i di-ha nwuru tukwasim obi-ha.
12. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, ndi anēkpeghi ikpe iṅu n'iko ahu aghaghi iṅu; ma gi onwe-gi, ì gābu kwa onye ahu nke anāmaghi ikpe ma-ọli? I gaghi-abu onye anāmaghi ikpe, n'ihi na i ghaghi iṅu.
13. N'ihi na Onwem ka M'jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi.
14. Akukọ ka m'nuworo sitere na Jehova, ọ bu kwa ukọ̀ ka ezigaworo n'etiti mba nile, si, Chikọtanu onwe-unu, bia imegide ya, bili-kwa-nu ibu agha.
15. N'ihi na, le, mba di ntà ka M'meworo gi n'etiti mba nile, bú ihe-nlelì n'etiti madu.