Jeremaia 33:3-6 Bible Nso (IGBOB)

3. Kpọkuem, na M'gāza gi, gosi kwa gi ihe uku di iche iche, nke di kwa ike ighọta, nke i nāmaghi.

4. N'ihi na okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere ulo nile nke obodo a, baye-kwa-ra ulo nile nke ndi-eze Juda, nke akwadaworo imegide obo-ihe nile atuliri atuli na imegide mma-agha, si:

5. Ha nābia ibuso ndi Kaldea agha, na imeju ha n'ozu madu ndi M'tib͕uworo n'iwem na n'ọnumam, ndi M'zonariwo-kwa-ra obodo a irum n'ihi ihe ọjọ nile ha.

6. Le, M'gaje ime ka anu-aru ọhu puchie n'aru ya, ya na ngwọta, M'gāgwọta kwa ha; M'gēkpughe-kwa-ra ha nbabiga-ókè nke udo na ezi-okwu.

Jeremaia 33