Jeremaia 29:29-31 Bible Nso (IGBOB)

29. Zefanaia, bú onye-nchu-àjà, we gua akwukwọ a na nti Jeremaia, bú onye-amuma.

30. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

31. Zigara ndi nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, si, Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shemaia onye-Nehelamait, si: N'ihi na Shemaia ebuworo unu amuma, ma Mu onwem eziteghi ya, o we me ka unu tukwasi okwu-ugha obi;

Jeremaia 29