38. Ma ọ buru na unu asi, Le, ibu Jehova nēbo; n'ihi nka ka Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu a, si, Le, ibu Jehova nēbo, ma eziteworom unu ozi, si, Unu asila, Le, ibu Jehova nēbo;
39. n'ihi nka, le, Mu onwem, M'gēchezọsi kwa unu, chupu unu na obodo ahu nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, n'irum: