11. Ma Jehova nọyerem dika dike nke nēme ka ama jijiji: n'ihi nka ndi nēsob͕um gāsu ngọngọ, ha agaghi-enwe kwa ike: ihere gēme ha nke-uku, n'ihi na ha enweghi uche, agaghi-echezọ ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi nke etiyere ha.
12. Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nānwa onye ezi omume, Onye nāhu akuru na obi, ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha; n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpém.
13. Bùkuenu Jehova abù, tonu Jehova: n'ihi na Ọ naputawo nkpuru-obi nke ob͕eye n'aka ndi nēme ihe ọjọ.
14. Ihe anābu ọnu ka ubọchi ahu bu nke amurum nime ya: ubọchi nke nnem murum, ya ghara ibu nke agọziri agọzi.
15. Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke ziri nnam ozi, si, Amutara gi nwa-nwoke; nēme ka ọ ṅuria ọṅu nke-uku.