Jeremaia 20:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Pashua nwa Imea, bú onye-nchu-àjà, nke bu kwa onye-nlekọta, onye-ndú n'ulo Jehova, Pashua ahu we nu ka Jeremaia nēbu amuma okwu ndia.

2. Pashua we tie Jeremaia, bú onye-amuma, ihe, tiye ya n'ọtọsi ahu nke di n'ọnu-uzọ-ama Benjamin di n'elu, nke di n'ulo Jehova.

3. O rue n'echi-ya, na Pashua mere ka Jeremaia si n'ọtọsi ahu puta. Jeremaia we si ya, Ọ dughi Pashua ka Jehova kpọworo aha-gi, kama ọ bu Megoa-misabibi.

4. N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje ime gi ka i ghọrọ onwe-gi, ghọ-kwa-ra ndi nile nāhu gi n'anya, ihe-ujọ: ha gāda kwa site na mma-agha ndi-iro-ha, anya-gi abua ganāhu kwa ya: ọ bu kwa Juda nile ka M'gēnye n'aka eze Babilon, ọ gēme kwa ka ha je biri na Babilon, ọ gēji kwa mma-agha tib͕ue ha.

Jeremaia 20