6. Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n'ọzara, n'ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n'ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n'ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n'ebe ahu?
7. M'we me ka unu bata n'ala nke ubi ọma, iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya: unu we bata, we merua alam, me ka ihe-nketam ghọ ihe-árú.
8. Ndi-nchu-àjà asighi, Òle ebe Jehova nọ? ọzọ, ndi ji iwum eme ihe amaghm: ndi-ọzùzù-aturu jehie-kwa-ra megidem, ndi-amuma ji-kwa-ra Beal bu amuma, ọ bu kwa ihe nādighi-abà urù ka ha jesoro.
9. N'ihi ya Mu na unu gēkpe kwa ikpe ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), Mu na umu umu-unu gēkpe kwa ikpe.
10. N'ihi na, gabiganu rue agwe-etiti nile nke Kitim, we hu; ziga-kwa-nu na Kida, we chigharia uche nke-uku; hu-kwa-nu ma ihe di otù a adiwo.
11. Ọ̀ di mba ab͕anweworo chi di iche iche ha, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? ma ndim ab͕anwewo nsọpuru-ha n'ihe nadighi-abà urù.
12. Ka ibodo ihe a nwu a unu n'aru, unu elu-igwe, tuanu oké ujọ, burunu ihe tọb͕ọrọ n'efu nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
13. N'ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.
14. Israel, ọ̀ bu orù? ọ̀ bu orù amuru n'ulo ka ọ bu? gini mere o ji ghọ ihe-nluta-n'agha?
15. Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n'efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi.
16. Ọzọ, umu Nof na Tahpanhes nērichapu opu-n'isi-gi.
17. Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n'irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n'uzọ?
18. Ma ub͕u a gini ka i nwere n'uzọ Ijipt, n'iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n'uzọ Asiria, n'iṅu miri nke Osimiri ahu?
19. Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n'aru gi, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
20. N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka M'b͕ajiworo yoke-gi, tijie ab͕u-gi nile; i we si, M'gaghi-efè òfùfè; n'ihi na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu nan'okpuru osisi ndu ọ bula ka gi onwe-gi nērulata onwe-gi, nākwa iko.