Jeremaia 11:4-6 Bible Nso (IGBOB)

4. nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, si n'oké ọku ígwè ahu, puta, si, Genu nti olum, me ha, dika ihe nile si di nke M'nēnye unu n'iwu: unu ewe burum otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke:

5. ka M'we me ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru nna-unu-hà, inye ha ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya, dika o si di ta. M'we za, si, Amen, Jehova.

6. Jehova we sim, Kpọsa okwu ndia nile n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem, si, Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha.

Jeremaia 11