Jeremaia 10:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Nurunu okwu Jehova gwaworo unu, unu ulo Israel:

2. Otú a ka Jehova siri, Unu amutala uzọ mba nile, unu atu-kwa-la ujọ ihe-iriba-ama di iche iche nke elu-igwe; n'ihi na mba nile nātu ujọ ha.

3. N'ihi na ukpuru nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: n'ihi na ọ bu nání osisi, nke madu b͕utuworo, ọlu aka abua nke onye-ọ̀kà ji anyu-ike alu ọlu.

4. Ha ji ọla-ọcha, ji kwa ọla-edo, eme ya ka ọ ma nma; ha ji ǹtú, ji kwa otùtù, eme ya ka o sie ike, ka ọ we ghara isu ngọngọ.

Jeremaia 10