8. Ma Noa hutara amara n'iru Jehova.
9. Ndia bu osuso-ọmumu Noa. Noa bu onye ezi omume, onye zuru okè n'ọb͕ọ-ya nile: Noa na Chineke yikọrọ nējeghari.
10. Noa we mua umu-ndikom atọ, Shem, na Ham, na Jefet.
11. Ma ebibiri uwa n'iru Chineke, uwa juputakwara n'ihe-ike.
12. Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa.
13. Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; n'ihi na uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gēbibi ha na uwa.