11. O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n'osisi vine,O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n'osisi vine kachasi nma;Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine,Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n'ọbara nkpuru-vine:
12. Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine,Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi.
13. Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi:Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o.Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon.
14. Isaka bu inyinya-ibu di ike,Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua:
15. Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma,Hu kwa ala ahu, na ọ di uto;Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu,We ghọ onye nēfè òfùfè orù.
16. Dan gēkpeputa ndi-ya,Dika otù nime ebo nile nke Israel.
17. Ka Dan buru agwọ n'uzọ,Aju-ala n'okporo-uzọ,Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru,Onye o nēbu we daghachi azu.
18. Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova
19. Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya:Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu.
20. Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya,Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze.
21. Naftali bu nne-ele arapuworo arapu:Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ.
22. Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu,Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi;Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.
23. Ndi-ọ̀kà-uta mere ya ihe-ilú,B͕a kwa ya àkú, kpọ kwa ya asì: