32. N'ihi na orù-gi nọrọ nwa-okoro ahu mbe n'ebe nnam nọ, si, Ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, eme-hiewokwam megide nnam ubọchi ndum nile.
33. Ma ub͕u a, biko, ka orù-gi nọdu n'ọnọdu nwa-okoro a iburu onye-nwem orù; ma ka nwa-okoro a soro umu-nne-ya rigo.
34. N'ihi na m'gesi aṅa rigokuru nnam, ma nwa-okoro a esoghm rigo? ka m'we ghara ilekwasi ihe ọjọ ahu anya nke gāchọta nnam.