23. Ndia bu kwa umu-ndikom Shobal; Alvan, na Manahat, na Ibal, na Shefo, na Onam.
24. Ndia bu kwa umu-ndikom Zibeon; Aia, na Ana: onye ahu bu Ana onye hutara isi-iyi nke miri di ọku n'ọzara, mbe ọ nāzù inyinya-ibu Zibeon, bú nna-ya, nwere.
25. Ndia bu kwa umu-ndikom Ana; Dishon, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana.
26. Ndia bu kwa umu-ndikom Dishon; Hemdan, na Eshban, na Itran, na Keran.
27. Ndia bu umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Akan.
28. Ndia bu umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran.