13. Chineke we si n'ebe ọ nọ rigo n'ebe Ọ kpayere ya uka.
14. Jekob we guzo ogidi ọtọ n'ebe ahu ebe Ọ kpayere ya uka, bú ogidi nkume: ọ wusi àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya, wusa kwa manu n'elu ya.
15. Jekob we kpọ aha ebe ahu ebe Chineke kpayere ya uka Bet-el.
16. Ha we si na Bet-el bulie ije; ma uzọ fọduru ibiaru Efrat: Rechel we nāmu nwa, ime nēmesi kwa ya ike mb͕e ọ nāmu nwa.
17. O rue, mb͕e ime nēmesi, ya ike, na nwayi nke nēle ime siri ya, Atula egwu; n'ihi na nka bu kwa nwa-nwoke i gēnwe.
18. O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu (n'ihi na ọ nwuru), na ọ kpọrọ aha-ya Ben-oni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin.