22. Ọ bu nání ma asi na ayi eme nka ka ndikom ahu gēkwere ayi ka ayi na ha biri, ighọ otù ndi, ọ buru na ebìe nwoke, ọ bula n'etiti ayi úgwù, dika ha onwe-ha bu ndi ebiri úgwù.
23. Anu-ulo-ha, na ihe ha nwetara, na anumanu-ha nile, ọ̀ bughi ayi gēnwe ha? ka ayi me nání nka, ka ayi kwere ha, ayi na ha gēbi kwa.
24. Ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu we ge Hemoa, ge kwa Shekem nwa-ya, nti; ewe bìe nwoke ọ bula úgwù, ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu.
25. O rue n'ubọchi nke-atọ, mb͕e o nēb͕u ha nb͕u, na madu abua n'etiti umu-ndikom Jekob, bú Simeon na Livai, umu-nne Daina, were mma-agha-ha n'otù n'otù, biakwasi obodo ahu mb͕e ọ di na ntukwasi-obi, ha we b͕ue ndikom nile.
26. Hemoa na Shekem nwa-ya ka ha b͕u-kwa-ra n'ọnu mma-agha, ha we kuputa Daina n'ulo Shekem, pua.