Jenesis 31:17-24 Bible Nso (IGBOB)

17. Jekob we bilie, palie umu-ya ndikom na ndinyom-ya dọkwasi ha n'elu camel-ya;

18. ọ we dupu anu-ulo-ya nile, na àkù-ya nile ọ kpatara, bú anu-ulo o nwetara, nke ọ kpatara na Padan-eram, ilakuru Aisak nna-ya rue ala Kenean.

19. Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n'ori.

20. Jekob we ghọb͕ue Leban onye Siria, n'ighara igosi ya na ya nāb͕alaga.

21. Ọ we b͕alaga, ya onwe-ya na ihe nile ọ nwere; ọ we bilie, gabiga Osimiri Yufretis, che iru-ya n'ugwu Gilead.

22. Ewe gosi Leban n'ubọchi nke-atọ na Jekob b͕alagarari.

23. Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead.

24. Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.

Jenesis 31