Jenesis 27:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. Ọ si, Biko, le, aghọwom agadi, amaghi ubọchi ọnwum.

3. Ma ub͕u a, biko, chiri ihe-gi, bú àkpà-àkú-gi na uta-gi, pua je ọhia, chutaram anu-nchuta;

4. sierem nri utọ, dika nke m'huru n'anya, butekwara m, ka m'we rie; ka nkpuru-obim we gọzie gi tutu mu anwua.

5. Ma Rebeka nānu ya mb͕e Aisak gwara Isọ, bú nwa-ya, okwu. Isọ we je ọhia ichuta anu-nchuta, na iweta ya.

6. Rebeka we gwa Jekob, bú nwa-ya, okwu, si Le, anurum nna-gi ka ọ nāgwa Isọ nwanne-gi okwu, si,

Jenesis 27