Jenesis 19:24-28 Bible Nso (IGBOB)

24. Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;

25. O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.

26. Ma nwunye-ya siri n'azu Lot leghachi anya n'azu, we ghọ ogidi nnú.

27. Abraham we bilie n'isi-ututu je ebe ahu nke o guzorori n'iru Jehova:

28. ọ le anya n'ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n'ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku.

Jenesis 19