Jenesis 16:6-8 Bible Nso (IGBOB)

6. Abram we si Serai, Le, nwayi nējere gi ozi di n'aka-gi; me ya ihe di nma n'anya-gi. Serai we weda ya ala, o we b͕apu n'iru-ya.

7. Mọ-ozi nke Jehova we hu ya n'akuku isi-iyi miri ahu di n'ọzara, n'akuku isi-iyi ahu di n'uzọ Shua.

8. Ọ si, Hega, nwayi nējere Serai ozi, òle ebe i siri bia? ọ̀ bu kwa ole ebe i nēje? Ọ si, Ọ bu n'iru Serai, bú nwayi-nwem, ka m'nāb͕apu.

Jenesis 16