Jenesis 15:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n'ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku.

2. Abram we si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, gini ka I gēnyem, ebe mu onwem gaje ib͕a aka nwa si n'uwa la, ma onye gēnweta ulom bu Damesek Elieza?

3. Abram si kwa, Le, mu ka I nēnyeghi nkpuru: le kwa, nwa-ulom bu onye nēnweta ihem.

4. Ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si, Nwoke a agaghi-enweta ihe-gi; kama onye gēsi n'afọ-gi puta, onye ahu gēnweta ihe-gi.

5. O me ka ọ puta n'èzí, Ọ si, Biko, legide anya n'ebe elu-igwe di, gua kpakpando, ọ buru na i puru igu ha: Ọ si ya, Otú a ka nkpuru-gi gādi.

6. Ọ we kwere na Jehova; Ọ we gua ya nye ya n'ezi omume.

7. Ọ si ya, Mu onwem bu Jehova Nke mere ka i si n'Ua nke ndi Kaldea puta, inye gi ala nka inweta ya.

8. Ọ si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, #m'gēji gini mara na m'gēnweta ya?

9. Ọ si ya, Chirim nwa-ab͕ọghọ-ehi nke b͕ara arọ atọ, na nne-ewu nke b͕ara arọ atọ, na ebulu nke b͕ara arọ atọ, na nduru, na nwa-kpalakwukwu.

10. O we chiri Ya ihe ndia nile, kpọwa ha n'etiti abua, tiye otù nkpọwa na ncherita-iru ibe-ya: ma ọ kpọwaghi nnunu abua ahu.

11. Udele we fedakwasi ozu-anu ahu, ma Abram chuliri ha.

12. O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya.

13. Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n'ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ;

14. ọzọ kwa, mba ahu nke ha gēfè ka M'ganēkpe ikpe: emesia ha gāchiri àkù uku puta.

15. Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ.

16. Ma n'ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n'ebe a: n'ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi.

Jenesis 15