Jenesis 12:16-20 Bible Nso (IGBOB)

16. Ọ we me Abram nke-ọma n'ihi ya: ọ we nwe ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na oke-inyinya-ibu, na ndi-orù ndikom, na ndinyom nēje ozi, na nne-inyinya-ibu, na kamel.

17. Ma Jehova were ihe-ọjọọ uku di iche iche tie Fero na ulo-ya n'ihi okwu bayere Serai, bú nwunye Abram.

18. Fero we kpọ Abram, si, Gini bu nka i meworom? n'ìhi gini ka a nēgosighm na nwunye-gi ka ọ bu?

19. N'ihi gini ka i siri, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? m'we luta ya n'onwem na nwunye: ma ub͕u a, le nwunye-gi, kuru ya, la.

20. Fero we nye ndikom ufọdu iwu bayere ya: ha we zilaga ya na nwunye-ya na ihe nile nke ọ nwere.

Jenesis 12