21. Shem kwa, amukwara umu nye ya onwe-ya, ọ bu nna umu nile nke Iba, nwa-nne nke-okenye nke Jefet.
22. Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram.
23. Umu-ndikom Eram kwa; Uz, na Hul, na Geta, na Mash.
24. Apakshad muru Shela; Shela muru Iba.
25. Amuru umu-ndikom abua nye Iba: aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan.
26. Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera;