1. Ma ndia bu osuso-ọmumu umu-ndikom Noa, bú Shem na Ham na Jefet: amukwara ha umu-ndikom, mb͕e iju-miri ahu gasiri.
2. Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras.
3. Umu-ndikom Goma kwa; Ashkenaz, na Rifat, na Togama.
4. Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Dodanim.
5. Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n'ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha.
6. Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean.
7. Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.