12. Ala we weputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha di iche iche, ya na osisi nke nāmi mkpuru di iche iche, nke nkpuru-ọghigha-ya di nime ya: Chineke we hu na ọ di nma.
13. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-atọ.
14. Chineke we si, Ka ihe nke nēnye ihè di na mbara elu-igwe ikpa ókè n'etiti ehihie na abali; ka ha buru kwa ihe igosi ihe-iriba-ama di iche iche, na igu mb͕e akara àkà, na igu ubọchi na arọ:
15. ka ha buru kwa ihe nēnye ìhè nime mbara elu-igwe inye ìhè n'elu uwa: o we di otú a.
16. Chineke we kpua ihe uku abua ahu nke nēnye ìhè; Ọ kpuru ihe ahu nēnye ìhè nke ka uku ka ọ nāchi ehihie, na ihe ahu nēnye ìhè nke ka ntà ka ọ nāchi abali: Ọ kpukwara kpakpando nile,
17. Chineke we tinye ha nime mbara elu-igwe inye ìhè n'elu uwa,
18. na ichi ehihie na ichi abali, na ikpa ókè n'etiti ìhè na ọchichiri: Chineke we hu na ọ di nma.
19. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-anọ.
20. Chineke we si, Ka miri nuputa ihe nēnuputa enuputa, bú anu nwere nkpuru-obi di ndu, ka anu-ufe feghari kwa n'elu uwa n'iru mbara elu-igwe.
21. Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma.