Jemes 3:8-12 Bible Nso (IGBOB)

8. ma ọ dighi onye ọ bula n'etiti madu puru imeju ire anya; ọ bu ihe ọjọ nke nādighi-eguzo n'otù ebe, ọ bu ihe juputara na irè-agwọ nēweta ọnwu.

9. Ọ bu nka ka ayi ji nāgọzi Onye-nwe-ayi, bú Nna-ayi; nka ka ayi ji kwa nābu madu ọnu, ndi ekèworo dika oyiyi Chineke si di:

10. n'otù ọnu ahu ka ngọzi na ọbubu-ọnu si puta. Umu-nnam, o kwesighi ka ihe ndia di otú a.

11. Ìsi-iyi nēsi n'otù ọnu ahu suputa miri nātọ utọ na miri nēlu ilu?

12. Umu-nnam, ọ̀ gābu na osisi fig puru imi olive, ma-ọbu na osisi vine puru imi fig? miri nnú apughi kwa isuputa miri nātọ utọ.

Jemes 3