Ilu 8:29-32 Bible Nso (IGBOB)

29. Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya,Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya:Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:

30. Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà:M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi,Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile;

31. Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya;Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ.

32. Ma ub͕u a, umum, genum nti:N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.

Ilu 8